1 Ihe E Mere 12

na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ (22) ndị si nʼezinaụlọ ya.

1 Chronicles 12:28 (UKJV) And Zadok, a young man mighty of valour, and of his father's house twenty and two captains.

26Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii. (4,600),

27tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa (3,700),

28na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ (22) ndị si nʼezinaụlọ ya.

29Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ (3,000), nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl.

30Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.