12Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”
13O bubataghị igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
14Igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ nọrọ nʼezinaụlọ Obed-Edọm nʼụlọ ya ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere.