7Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:
8Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya, meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
9Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto; kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.
10Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.
11Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.