1 Ihe E Mere 2

Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.

1 Chronicles 2:25 (UKJV) And the sons of Jerahmeel the firstborn of Hezron were, Ram the firstborn, and Bunah, and Oren, and Ozem, and Ahijah.

23Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.

24Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.

25Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.

26Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.

27Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a: Maaz, na Jamin, na Eka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.