1Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.
2Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị.
3A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ.
4Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,