4Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
5E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
6Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
7Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
8nke atọ, Harim nke anọ, Seorim