3Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.
4Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii. Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ.
5Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
6Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet,
7Noga, Nefeg, Jafia,