14Meonotai bụ nna Ofra. Seraya bụ nna Joab, Joab bụ nna Ge Harashim. A kpọrọ ha Ge Harashim nʼihi na ha bụ ndị ǹka.
15Kaleb nwa Jefune mụrụ Iru, Elaa na Naam. Ma Elaa mụrụ Kenaz.
16Ụmụ ndị ikom Jehalelel mụrụ bụ ndị a: Zif, Zifa, Tiria na Asarel.
17Ụmụ Ezra bụ Jeta, Mered, Efaa na Jalon. Otu nʼime ndị nwunye Mered lụrụ mụtara Miriam, Shamai na Ishba, bụ nna Eshtemoa.
18Ndị a bụkwa ụmụ ndị ikom Bitaya, bụ nwa nwanyị Fero, nke Mered lụrụ. Nwunye ya nke si nʼebo Juda mụrụ Jered bụ nna Gedoa, Heba nna Soko na Jekutiel nna Zanoa.