4Penuel bụ nna Gedoa, Eza bụ nna Husha. Ndị a bụ ụmụ Hua, bụ ọkpara Efrata, nna Betlehem.
5Ashua nna Tekoa lụrụ ndị nwunye abụọ: Hela na Naara.
6Naara mụtaara ya Ahuzam, na Hefa, na Temeni, na Haahashitari. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naara.
7Ụmụ ndị ikom Hela mụtara bụ Zeret, Zoha, Etnan
8na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum.