11Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.
12Ndị Shupim na ndị Hupim bụ ụmụ ụmụ Er ebe ndị Hushim bụ ụmụ ụmụ Aha.
13Ụmụ Naftalị mụtara bụ Jaziel, Guni, Jeza na Shalum bụ ụmụ Bilha.
14Ụmụ Manase: Asriel, onye iko ya nwanyị bụ onye Aram mụtara, na Makia. Makia bụ nna Gilead.
15Makia sitere nʼetiti ndị Hupim na Shupim lụọ nwunye. Aha nwanne ya nwanyị bụ Maaka. Otu onye ọzọ si nʼagbụrụ Manase bụ Zelofehad, onye mụtara naanị ụmụ ndị inyom.