17Nwa nwoke Ụlam mụtara bụ Bedan. Ndị a bụ ụmụ Gilead, nwa nwa Makia, nwa Manase.
18Hamoleket, nwanne nwanyị Makia mụrụ Ishod, Abieza na Mahla.
19Shemida mụrụ ụmụ ikom ndị a: Ahian, Shekem, Liiki na Aniam.
20Ụmụ Ifrem bụ Shutela, Bered, Tahat, Eleada, Tahat
21na Zabad nwa ya, na Shutela nwa ya. Eza na Elead bụ ndị gara ịchịkọrọ anụ ụlọ ndị Gat, ndị ikom nwe obodo ahụ jidere ha gbuo ha nʼebe ahụ.