7Bela mụrụ ụmụ ise: Ezbon, Uzi, Uziel, Jerimot na Iri. Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị agha ha dị iri puku abụọ na abụọ na iri atọ na anọ (22,034). E dekwara aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
8Ụmụ ndị ikom Beka mụrụ bụ Zemira, Joash, Elieza, Elioenai, Omri, Jeremot, Abija, Anatot na Alemet.
9Akwụkwọ ebe e dere usoro ọmụmụ ha depụtara aha ndịisi ezinaụlọ, na iri puku ndị agha abụọ na narị abụọ (20,200).
10Jediael mụrụ otu nwa nwoke: aha ya bụ Bilhan. Ụmụ Bilhan bụ Jeush, Benjamin, Ehud, Kenaana, Zetan, Tashish na Ahishaha.
11Ụmụ ndị ikom Jediael ndị a bụ ndịisi ezinaụlọ. E nwere nʼetiti ha ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asaa na narị abụọ (17,200), ndị nọ na njikere ibu agha.