23Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
24Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.
25Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa.
26Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.
27Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile.