33Ndị ọbụ abụ, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị na-anọgide nʼime ọnụụlọ ndị dị nʼụlọnsọ ukwu nʼihi na e kweghị ka ha rụọ ọrụ ọzọ ebe ọ bụ na ha na-arụ ọrụ ịbụ abụ ehihie na abalị niile.
34Ha niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼebo Livayị. Ndị ndu dịka e depụtakwara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ha bikwa na Jerusalem.
35Jeiel nna Gibiọn bụ na Gibiọn ka o bi, Aha nwunye ya bụ Maaka.
36Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
37Gedoa, Ahio, Zekaraya na Miklot.