1 Ndị Kọrint 1

Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.

1 Corinthians 1:22 (UKJV) For the Jews require a sign, and the Greeks seek after wisdom:

20Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu?

21Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.

22Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.

23Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu.

24Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.