25Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
26Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo.
27Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.
28Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.
29Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.