1Ugbu a ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe gbasara onyinye nke Mmụọ Nsọ na-enye.
2Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi.
3Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta nke ọma na ọ dịghị onye ọbụla na-ekwu okwu site nʼodudu Mmụọ nke Chineke, pụrụ ị sị, “Ka Jisọs bụrụ onye a bụrụ ọnụ.” Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ikwu, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” ma ọ bụghị site na Mmụọ Nsọ.
4Onyinye amara dị iche iche dị, ma otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha niile.