1 Ndị Kọrint 14

Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.

1 Corinthians 14:14 (UKJV) For if I pray in an unknown tongue, my spirit prays, but my understanding is unfruitful.

12Ebe ọ na-agụ unu agụụ inweta onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ elu.

13Onye ọbụla na-asụ asụsụ nʼolu dị iche iche, ga-ekpe ekpere ka e nye ya onyinye ịkọwa olu dị iche iche.

14Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.

15Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere, jirikwa uche kpee ekpere. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ, jirikwa uche m bụọ abụ.

16Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.