16Ma o bụghị otu a, mgbe i ji asụsụ ọzọ nke a na-amaghị na-eto Chineke nʼime mmụọ, olee otu ndị niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amen?
17Ọ bụ ezie na ị na-enye ekele nke ọma, ma ọ naghị ewuli onye ọbụla elu.
18Ana m ekele Chineke nʼihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu niile.
19Ma mgbe ọbụla a gbakọrọ na nzukọ ife ofufe, ọ na-akara m mma ikwu naanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ niile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nʼasụsụ dị iche iche nke onye ọbụla na-apụghị ịghọta.
20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a.