25Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”
26Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu.
27A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu, ka mmadụ abụọ maọbụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nʼotu nʼotu nʼusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nʼebe ahụ.
28Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya.
29Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru.