1 Ndị Kọrint 14

Unu chere na okwu Chineke malitere nʼaka unu? Unu chekwara na ọ ga-akwụsị nʼaka unu? Ụgha!

1 Corinthians 14:36 (UKJV) What? came the word of God out from you? or came it unto you only?

34Ụmụ nwanyị ekwesighị ikwu okwu nʼime chọọchị. Ha ekwesighị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọbụla, nʼihi na iwu kwuru ka ha debe onwe ha nʼokpuru ndị ọchịchị.

35Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nʼụlọ. Nʼihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nʼime ọgbakọ chọọchị.

36Unu chere na okwu Chineke malitere nʼaka unu? Unu chekwara na ọ ga-akwụsị nʼaka unu? Ụgha!

37Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, maọbụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, naanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nʼonwe ya nyere m.

38Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ịnabata ihe ndị a, unu aṅala ya ntị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.