29Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha?
30Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla?
31Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị.
32Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”
33Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.