39Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha.
40Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche.
41Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube.
42Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ.
43A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike.