44A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite. Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ.
45E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.”
46Ma mmụọ e bughị ụzọ, kama ọ bụ ahụ nkịtị, ma mmụọ bịara nʼikpeazụ.
47Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa.
48Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.