52Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.
53Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ.
54Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.”
55“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?”
56Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu.