56Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu.
57Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
58Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.