1 Ndị Kọrint 2

Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.

1 Corinthians 2:13 (UKJV) Which things also we speak, not in the words which man's wisdom teaches, but which the Holy Spirit teaches; comparing spiritual things with spiritual.

11Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.

12Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.

13Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.

14Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.

15Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.