1 Ndị Kọrint 2

Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.

1 Corinthians 2:16 (UKJV) For who has known the mind of the Lord, that he may instruct him? But we have the mind of Christ.

14Ma mmadụ ahụ Mmụọ na-adịghị nʼime ya adịghị anabata ihe ndị ahụ sị na Mmụọ nke Chineke bịa, nʼihi na ha bụ nzuzu nʼebe onye ahụ nọ. Ọ naghị aghọta ha, nʼihi na ha bụ ihe a na-aghọta naanị site nʼike nke Mmụọ.

15Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọbụla ma ya onwe ya bụ onye mmadụ ọbụla na-enweghị ike ịghọta.

16Nʼihi na, “Onye maara uche Onyenwe anyị ruo na ọ ga-ezi ya ụzọ?” Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.