19Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”
20Ọzọkwa, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”
21Nʼihi nke a, ka onye ọbụla ghara ịnya isi banyere mmadụ. Ihe niile bụ nke gị.
22Ma ọ bụ Pọl, maọbụ Apọlọs, maọbụ Sefas, maọbụ ụwa a, maọbụ ndụ, maọbụ ọnwụ, maọbụ ihe dị taa na ihe niile ga-adị nʼoge dị nʼihu, ha bụ nke unu.
23Unu bụkwa nke Kraịst, Kraịst bụkwa nke Chineke.