19Ma site nʼike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nʼoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu.
20Nʼihi na alaeze Chineke abụghị ihe okwu ọnụ kama ọ bụ ngosipụta ịdị ike.
21Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa?