1 Ndị Kọrint 6

Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.

1 Corinthians 6:19 (UKJV) What? know all of you not that your body is the temple of the Holy Spirit which is in you, which all of you have of God, and all of you are not your own?

17Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ.

18Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.

19Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.

20E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.