1Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ?
2Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu?
3Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a?
4Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya?