1 Jọn 1

Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.

1 John 1:3 (UKJV) That which we have seen and heard declare we unto you, that all of you also may have fellowship with us: and truly our fellowship is with the Father, and with his Son Jesus Christ.

1Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ.

2Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị.

3Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.

4Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke.

5Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.