1 Jọn 1

Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.

1 John 1:9 (UKJV) If we confess our sins, he is faithful and just to forgive us our sins, and to cleanse us from all unrighteousness.

7Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.

8Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị.

9Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.

10Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.