16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
17Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
18Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.
19Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.
20Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile.