23Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ.
24Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ.
25Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi.
26Ana m edere unu ihe ndị a banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu.
27Ma unu onwe unu, otite mmanụ ahụ unu natara nʼaka ya na-anọgide nʼime unu, nʼihi nke a, onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Dịka otite mmanụ ya na-ezi unu ihe banyere ihe niile, bụrụkwa eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha. Ya mere, dịka o zikwara unu, na-anọgidenụ nʼime ya.