1 Jọn 2

Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile.

1 John 2:3 (UKJV) And hereby we do know that we know him, if we keep his commandments.

1Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.

2Ọ bụ onye jiri onwe ya chụọ aja nʼihi ikpuchiri anyị mmehie anyị, ma ọ bụghị naanị nʼihi mmehie anyị, ọ bụkwa nʼihi mmehie ụwa niile.

3Otu a ka anyị si amata na anyị maara onye ọ bụ, ma ọ bụrụ na anyị erube isi nye iwu ya niile.

4Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya.

5Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.