4Onye ahụ na-ekwu sị, “Amaara m ya,” ma ọ dịghị eme ihe o nyere nʼiwu bụ onye okwu ụgha, eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime ya.
5Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-erube isi nʼokwu ya, nʼezie, ịhụnanya Chineke bụ ihe emere ka o zuo oke nʼime ya. Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị nọ nʼime ya.
6Onye ọbụla na-ekwu na ya bi nʼime ya kwesiri ibi ndụ dịka ya.
7Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya.
8Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.