1 Jọn 3

Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.

1 John 3:1 (UKJV) Behold, what manner of love the Father has bestowed upon us, that we should be called the sons of God: therefore the world knows us not, because it knew him not.

1Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya.

2Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.

3Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.