4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa.
5Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.
6Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
7Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke.
8Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.