1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya.
2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.