2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile.
3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ.
4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị.
5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
6Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.