19O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị.
20Ma ugbu a, onyenwe m eze, ndị Izrel niile na-ele gị anya isi nʼọnụ gị nụta onye ga-anọchi anya gị, ịnọkwasị nʼocheeze eze gị.
21Ma ọ bụghị otu a, ngwangwa onyenwe m bụ eze ga-esoro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, mụ onwe m na nwa m Solomọn ka a ga-emeso mmeso dịka ndị mmebi iwu.”
22Mgbe Batsheba nọ na-akpanyere eze ụka, Netan onye amụma batara.
23A gwara eze okwu sị, “Netan onye amụma nọ nʼebe a.” Ya mere, ọ gara nʼihu eze kpọọ isiala nye ya.