1 Ndị Eze 1

Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”

1 Kings 1:52 (UKJV) And Solomon said, If he will show himself a worthy man, there shall not an hair of him fall to the earth: but if wickedness shall be found in him, he shall die.

50Ma Adonaịja tụrụ egwu nke ukwuu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya, ọ gara jide mpi dị nʼebe ịchụ aja aka.

51Mgbe ahụ, a gwara Solomọn sị, “Adonaịja na-atụ egwu ihe Solomọn ga-eme ya, nʼihi ya ọ na-ejide mpi ebe nchụaja aka. Ọ na-asị, ‘Ka eze Solomọn ṅụọra m iyi taa sị na ọ gaghị eji mma agha gbuo ohu ya.’ ”

52Solomọn zara sị, “Ọ bụrụ na o gosi onwe ya dịka onye kwesiri ntụkwasị obi, otu agịrị isi dị ya nʼisi agaghị ada nʼala, ma ọ bụrụ na a hụta ihe ọjọọ na nʼaka ya, ọ ga-anwụ.”

53Mgbe ahụ, eze Solomọn, zigara ndị ozi mere ka o site nʼebe nchụaja rịdata. Adonaịja bịara kpọọ isiala nye eze Solomọn. Mgbe ahụ, Solomọn sịrị ya, “Laa nʼụlọ gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.