16Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla.
17Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
18Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie.
19Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii, o nwere elu dị gburugburu nʼazụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
20Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.