13Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
14Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?” Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.”
15Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.”
16Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a.
17Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ”