16Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.”
17Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha.
18Ha liri ya, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Ahija, onye amụma.
19Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere.
20Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.