10Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
11Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere.
12O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere.
13Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
14Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile.