20Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị.
21Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza.
22Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.
23Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi.
24Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.