24Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
25Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ.
26O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
27Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya.
28Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.